Matthew 14

Ọnwụ Jọn omee baptizim

1Nʼoge a Herọd eze na-achị Galili nụrụ ihe banyere Jisọs. 2Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Onye a bụkwanụ Jọn omee baptizim. O sitela na ndị nwụrụ anwụ bilie dịkwa ndụ ọzọ. Ọ bụ ya mere ike ịrụ ọrụ ebube ndị a ji dị nʼime ya.”

3Nʼihi na, Herọd jidere Jọn kee ya agbụ tinye ya nʼụlọ mkpọrọ, nʼihi Herodịas nwunye Filip nwanne ya nwoke. 4Nʼihi na Jọn gwara ya, “Ọ bụghị ihe ziri ezi nʼiwu ka ị kpọrọ ya.” 5Herọd chọrọrị igbu ya, ma ọ tụrụ egwu ndị mmadụ, nʼihi na ha weere Jọn dị ka onye amụma.

6Ma mgbe a na-eme mmemme icheta ọmụmụ Herọd, ada Herodịas tere egwu nʼihu Herọd, na nʼihu ndị ọbịa bịara nʼụbọchị ahụ. Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu. 7Nke a mere o ji ṅụọ iyi kwee nkwa inye ya ihe ọbụla ọ rịọrọ. 8Ma dị ka nne ya si haziere ya, ọ rịọrọ eze Herọd sị, “Nye m isi Jọn omee baptizim nʼefere ugbu a.” 9Arịrịọ a wutere eze Herọd, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ na nʼihi ndị ọbịa ya niile, ọ chọghị ịla azụ nʼokwu ya. O nyere iwu ka e meere ya ihe ọ chọrọ. 10O ziri ozi ka e bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ. 11E tinyere isi ya nʼefere bunye nwaagbọghọ ahụ. Ọ naara ya bulaara nne ya. 12Ndị na-eso ụzọ ya bịara buru ozu ya gaa lie. Ha gara kọọrọ Jisọs ihe mere.

Jisọs enye puku mmadụ ise nri

13Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma mgbe igwe mmadụ nụrụ ya, ha si obodo dị iche iche sooro ya nʼukwu ala. 14Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri ahụ rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, gwọọ ndị ọrịa nʼetiti ha.

15Nʼoge anyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Chi na-achọ iji. Ebe a abụkwaghị ebe ndị mmadụ bi. O nweghị nri a ga-azụta nʼọzara a. Zilaga igwe mmadụ ndị a ka ha gaa nʼime obodo zụọra onwe ha nri.”

16Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ dịghị mkpa na ha ga-ala. Nyenụ ha nri ka ha rie.”

17Ha zara ya sị, “Ọ bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ ka anyị nwere.”

18Ọ sịrị ha, “Wetaranụ m ha nʼebe a.” 19Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼahịhịa. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu nye Chineke ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya nyere ha igwe mmadụ ahụ. 20Onye ọbụla riri rijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe achịcha dara nʼala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ. 21Ma ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke ise, nʼagụnyeghị ụmụ nwanyị, na ụmụntakịrị.

Jisọs agaa ije nʼelu mmiri

22Mgbe nke a gasịrị, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nʼụgbọ malite ịgafe ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ma ya onwe ya nọdụrụ maka izilaga ndị mmadụ ahụ. 23Mgbe ọ zilagasịrị igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere, naanị ya. Mgbe oge anyasị ruru, naanị ya nọkwa na-ebe ahụ. 24Ma nʼoge a ụgbọ mmiri ahụ esitela nʼebe ala dị nso gamie nʼelu osimiri, ebili mmiri na-ebugharịkwa ya, nʼihi na ifufe ahụ na-emegide ya.

25Ma ihe dị ka site nʼelekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ, Jisọs bịakwutere ha, na-aga ije nʼelu osimiri. 26Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri ahụ, obi lọrọ ha mmiri, ha sị, “Ọ bụkwanụ mmụọ o!” Ha tiri mkpu nʼihi egwu.

27Ma ngwangwa Jisọs sịrị ha, “Nweenụ obi ike! O bụ m; unu atụla egwu.”

28Pita zara ya, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, sị m bịakwute gị nʼelu mmiri.”

29Ọ sịrị ya, “Bịa!”

Pita sitere nʼụgbọ ahụ pụta, bido ịga ije nʼelu mmiri ijekwuru Jisọs.
30Ma mgbe ọ hụrụ oke ebili mmiri ahụ ka ọ na-amagharị; egwu tụrụ ya. Ma mgbe ọ malitere imikpu nʼime mmiri ahụ, o tiri mkpu sị, “Onyenwe m! Zọpụta m!”

31Na-atụfughị oge, Jisọs setịpụrụ aka ya dọpụta Pita. Ọ sịrị ya, “Gị onye okwukwe nta, nʼihi gịnị ka i ji nwee obi abụọ!”

32Ma mgbe ha rịbanyere nʼime ụgbọ ahụ ifufe ahụ kwụsịkwara. 33Ndị ahụ nọ nʼụgbọ ahụ kpọrọ isiala nye ya sị, “Nʼezie, ị bụ Ọkpara Chineke.”

Ọgwụgwọ ndị ọrịa na Genesaret

34Mgbe ha gafere nʼofe nke ọzọ, ha bịarutere nʼala Genesaret. 35Mgbe ndị obodo ahụ matara na ọ bụ ya, ha zisara ozi gburugburu obodo niile ahụ, ma dutere ya ndị niile ahụ na-adịghị ike. 36Ha rịọrọ ya ka o kwenye ka ha metụ ọ bụladị ọnụ uwe ya aka. Ndị niile metụrụ ya aka ka a gwọrọ.

Copyright information for IboBIU